Revelation 6:15 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ndị eze nile nke ụwa na ndị nọ nꞌọchịchị dị iche iche, na ndị ọgaranya, na ndị nọ nꞌọnọdụ dị elu, na ndị ọchịagha, na ndị mmadụ nile dị iche iche, ndị ukwu ma ndị nta, ndị ohu na ndị nwe onwe ha, ha nile gara zoo onwe ha nꞌime ọgba nkume na nꞌokpuru ugwu, na-eti mkpu na-arịọ ugwu ndị ahụ na-asị ha,
Igbo 2006
Ndi-eze nke uwa, na ndi-amadi, na ndi-isi-ọchi-agha, na ndi-ọgaranya, na ndi di ike, na orù ọ bula, na onye ọ bula nwere onwe-ya, we zobe onwe-ha nime ọb͕à na nime oké nkume nke ugwu:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị eze niile nke ụwa na ndị nọ nʼọchịchị dị iche iche, na ndị ọgaranya, na ndị nọ nʼọnọdụ dị elu, na ndị ọchịagha, na ndị mmadụ niile dị iche iche, ndị ukwu ma ndị nta, ndị ohu na ndị nwe onwe ha, ha niile gara zoo onwe ha nʼime ọgba nkume na nʼokpuru ugwu,