Revelation 6:2 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe m lere anya nꞌihu m, ahụrụ m inyinya dị ọcha. Onye ahụ na-anọkwasị nꞌelu ya ji ụta nꞌaka ya. A tụkwasịkwara okpu eze nꞌisi ya. Ọ bụkwa nꞌebe nile ka ọ na-ejegharị ibu agha na imeri emeri.
Igbo 2006
M'we hu, ma le, inyinya ọcha, Onye nānọkwasi ya nwe-kwa-ra uta; ewe nye Ya okpu-eze: O we puta nēmeri, ya na ka O we meri.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe m lere anya, ahụrụ m ịnyịnya dị ọcha. Onye na-anọkwasị nʼelu ya ji ụta nʼaka ya. A tụkwasịkwara okpueze nʼisi ya dịka onye agha na-emeri emeri mgbe niile.