Revelation 6:4 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌoge a, inyinya ahụ na-acha ọbara ọbara gbapụtara. E nyere onye ahụ na-anọkwasị nꞌelu ya mma agha dị ogologo nyekwa ya ike ime ka udo hapụ ịdịkwa nꞌụwa. E nyekwara ya ike iwebata ọchịchị nke ndị na-emegide emegie nꞌime ụwa. Mgbe ahụ ibu agha dị iche iche na igbu mmadụ jupụtara nꞌebe nile.
Igbo 2006
Inyinya ọzọ we puta, bú inyinya nke nācha ọku ọku: ewe nye onye nānọkwasi ya ike inapu udo n'uwa, ya na ka ha we b͕urita onwe-ha: ewe nye ya oké mma-agha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, ịnyịnya ọzọ na-acha ọbara ọbara pụtara. E nyere onye nọkwasịrị nʼelu ya ike iwepụ udo nʼụwa nakwa ime ka ụmụ mmadụ na-egburita ibe ha. E nyekwara ya mma agha dị ukwuu.