Revelation 6:8 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ahụrụ m inyinya na-adịghị ezi ọcha. Aha onye na-anọkwasị ya nꞌelu bụ ọnwụ, Inyinya ọzọ nke onye ọzọ a na-akpọ ọkụ ala mmụọ nọkwasịrị na-esokwa ya nꞌazụ. E kere ụwa ụzọ anọ, nyefee ha otu ụzọ nꞌaka, ka ha jiri ọnwụ na ọrịa na anụ ọhia gbuchapụ ndị nile bi nꞌime ha.
Igbo 2006
M'we hu, ma le, inyinya nke aru-ya yiri ozu: onye nānọkwasi kwa ya, aha-ya bu Ọnwu; Hedis we so ya ga. Ewe nye ha ike ichi otù uzọ n'uzọ anọ nke uwa, iji mma-agha, na iji oké unwu, na iji ọnwu, nēb͕u, iwere kwa anu-ọhia nke uwa nēb͕u.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Elere m anya ma hụ ịnyịnya na-acha ntụntụ nʼihu m. Aha onye nọkwasịrị nʼelu ya bụ Ọnwụ na Ọkụ ala mmụọ na-esokwa ya nʼazụ. E nyere ha ike nʼebe otu ụzọ nʼụzọ anọ nke ụwa dị ka ha jiri mma agha na ụnwụ, na ọrịa ọjọọ na anụ ọhịa gbuchapụ ndị bi nʼime ha.