Revelation 6:9 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma mgbe a nyakapụrụ akara nke ise, ahụrụ m otu ebe ịchụ aja. Nꞌokpuru ebe ịchụ aja ahụ ka m hụrụ mkpụrụ obi ndị nile nwụrụ anwụ nꞌihi ozi ọma nke Chineke na nꞌihi na ha guzosịrị ike ịgba ama nke eziokwu na nke ndụ zuru oke.
Igbo 2006
Mb͕e Ọ saghe-kwa-ra akàrà nke-ise, m'we hu n'okpuru ebe-ichu-àjà ahu nkpuru-obi nke ndi eb͕ururi n'ihi okwu Chineke, na n'ihi àmà ahu nke ha nwere:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma mgbe ọ meghere akara nke ise, ahụrụ m nʼokpuru ebe ịchụ aja mkpụrụobi ndị niile e gburu egbu nʼihi okwu Chineke na nʼihi ịgba ama nke ha jidesiri ike.