Revelation 7:11 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ihe ndị a na-eme, ndị mmụọ ozi nile bịara nso ocheeze ahụ na-agba ya gburugburu, na-agbakwa ocheeze ndị okenye ahụ gburugburu na ihe e kere eke anọ ahụ dị ndụ. Ndị mmụọ ozi ndị a nile na-akpọkwa isi ala nꞌihu Onye ahụ nọ nꞌocheeze ahụ. Ha na-efekwa Chineke ofufe, na-asị,
Igbo 2006
Ndi-mọ-ozi nile nēguzo kwa oche-eze ahu na ndi-okenye ahu na ihe anọ ahu nke di ndu gburugburu; ha we da kpuchie iru-ha n'ala n'iru oche-eze ahu, we kpọ isi ala nye Chineke,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị mmụọ ozi niile ahụ guzoro ocheeze ahụ gburugburu, ha na ndị okenye ahụ na anụ anọ ahụ dị ndụ. Ha dara, kpuo ihu ha nʼala nʼihu ocheeze ahụ feekwa Chineke ofufe,