Revelation 7:2 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ahụ ahụkwara m mmụọ ozi ọzọ ka o si nꞌọwụwa anyanwụ na-apụta. Akara Chineke dị ndụ dịkwa nꞌaka ya. O tikuru ndị mmụọ ozi anọ ahụ mkpu, bụ ndị ahụ e nyere ike imekpa ụwa ahụ, ya na oke osimiri na ihe nile dị nꞌime ha, sị ha,
Igbo 2006
M'we hu mọ-ozi ọzọ ka o nēsi n'ọwuwa-anyanwu rigo, nēnwe akàrà nke Chineke di ndu; o we were oké olu tiere ndi-mọ-ozi anọ ahu nkpu, bú ndi enyere ha ike imejọ uwa na oké osimiri,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, ahụkwara m mmụọ ozi ọzọ ka o si nʼọwụwa anyanwụ na-apụta, akara Chineke dị ndụ dịkwa nʼaka ya. O tikuru ndị mmụọ ozi anọ ahụ mkpu, bụ ndị ahụ e nyere ike imekpa ụwa ahụ, ya na oke osimiri,