Revelation 7:4 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe a kasịrị ha akara ndị a, anụrụ m ọnụ ọgụgụ ndị natara akara ahụ. Ha dị narị puku mmadụ, na iri puku mmadụ anọ na anọ. E sitere nꞌebo iri na abụọ nke ndị Izirel họpụta ha. Ndị sitere nꞌebo Juda dị puku mmadụ iri na abụọ. Ndị si nꞌebo Ruben dịkwa puku mmadụ iri na abụọ. Puku mmadụ iri na abụọ sikwa nꞌebo Gad. E sitekwara nꞌebo Asha họpụta puku mmadụ iri na abụọ. Ndị si nꞌebo Naftali dị puku mmadụ iri na abụọ. Ọ bụkwa puku mmadụ iri na abụọ ka e si nꞌebo Manase họpụta. Ndị si nꞌebo Simiọn dị puku mmadụ iri na abụọ. Otu a kwa a họpụtara puku mmadụ iri na abụọ site nꞌebo Livayị. Ndị si nꞌebo Isaka dị puku mmadụ iri na abụọ. Ọ bụkwa puku mmadụ iri na abụọ ka e si nꞌebo Zebulọn họpụta. Puku mmadụ iri na abụọ si nꞌebo Josef. Ndị sikwa nꞌebo Benjamin pụta dị puku mmadụ iri na abụọ.
Igbo 2006
M'we nu ọnu-ọgugu ndi akarari, ọgu nnù iri na ọgu nnù asatọ, ndi akarari akàrà site n'ebo nile ọ bula nke umu Israel.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ anụrụ m ọnụọgụgụ ndị a kara akara ahụ, ha dị narị puku mmadụ, na iri puku mmadụ anọ na anọ, bụ ndị sitere nʼebo niile nke Izrel.