Revelation 7:9 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ihe ndị a gasịrị, ahụrụ m igwe mmadụ, ndị dị ọtụtụ nꞌọnụ ọgụgụ. Ha sitere na mba dị iche iche na ebo dị iche iche, na asụsụ dị iche iche. Ha guzo nꞌihu ocheeze ahụ na nꞌihu Nwa atụrụ ahụ. Ha yikwasịrị onwe ha uwe dị ọcha, jirikwa igu nkwụ nꞌaka ha.
Igbo 2006
Mb͕e ihe ndia gasiri m'we hu, ma le, oké ìgwè madu, nke onye ọ bula nāpughi iguta ọnu, ndi si na mba nile ọ bula, na ebo nile, na ndi nile, na asusu nile, puta, nēguzo n'iru oche-eze ahu na n'iru Nwa-aturu ahu, eb͕okwasiworo ha uwe-nwuda di ọcha, igu-nkwu di kwa n'aka-ha;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ihe ndị a gasịrị, ahụrụ m oke igwe mmadụ, ndị dị ọtụtụ nʼọnụọgụgụ nke onye ọbụla na-apụghị ịgụta ọnụ. Ha sitere na mba dị iche iche na ebo dị iche iche na ndị niile na asụsụ dị iche iche, na-eguzo nʼihu ocheeze ahụ na nʼihu Nwa Atụrụ ahụ. Ha yikwasịrị onwe ha uwe ọcha, jirikwa igu nkwụ nʼaka ha.