Revelation 8:10 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe mmụọ ozi nke atọ fụrụ opi ike ya, otu kpakpando dịkarịsịrị ukwuu sitere na mbara eluigwe danye nꞌime otu ụzọ nꞌime ụzọ atọ e kere iyi nile na isi iyi nile, ebe ndị mmadụ si ekute mmiri ha na-aṅụ.
Igbo 2006
Mọ-ozi nke-atọ we fùa opì, oké kpakpando we site n'elu-igwe da, nke nēre ọku dika ọwa, o we da n'elu otù uzọ n'uzọ atọ nke osimiri nile, da kwa n'elu isi-iyi miri nile;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe mmụọ ozi nke atọ fụrụ opi ike ya, otu kpakpando dịkarịsịrị ukwuu nke na-enwu dị ka ọwaọkụ sitere na mbara eluigwe danye nʼime otu ụzọ nʼime ụzọ atọ e kere iyi niile na isi iyi niile.