Revelation 8:11 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Aha kpakpando ahụ bụ Ilu ilu. Nꞌihi na o mere ka ihe ilu bịakwasị otu ụzọ nꞌime ụzọ atọ nke iyi nile na isi iyi nile, mee ka ọtụtụ mmadụ nwụọ nꞌihi akpịrị ịkpọ nkụ.
Igbo 2006
aha anākpọ kwa kpakpando ahu bu Wormwood: otù uzọ n'uzọ atọ nke miri nile we ghọ wormwood; ọtutu madu we site n'iṅu miri ahu nwua, n'ihi na emere ka ha nēlu ilu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Aha kpakpando ahụ bụ Ilu ilu. Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke mmiri malitere ilu ilu, ọtụtụ mmadụ nwụrụ nʼihi mmiri a na-elu ilu.