Revelation 8:13 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe m nọ na-ele ihe ndị a anya, ahụrụ m otu ugo buru ibu ka ọ na-efegharị na mbara eluigwe na-eti mkpu na-asị, “Ahụhụ! Ahụhụ dịrị mmadụ nile bi nꞌụwa nꞌihi ihe ọjọọ dị iche iche gaje ịbịakwasị ha mgbe ndị mmụọ ozi atọ fọdụrụ fụrụ opi ike ha.”
Igbo 2006
M'we hu, nu kwa otù ugo, ka ọ nēfe n'etiti elu-igwe, were kwa oké olu si, Ahuhu, ahuhu, ahuhu, ka ha gāhu, bú ndi bi n'elu uwa, site n'olu fọduru nke opì ndi-mọ-ozi atọ, ndi gaje ifù opì.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Elere m anya, hụ ma nụkwa otu ugo ka ọ na-efegharị nʼetiti mbara eluigwe na-eti mkpu nʼolu ike na-asị, “Ahụhụ! Ahụhụ! Ahụhụ dịrị mmadụ niile bi nʼụwa nʼihi ụda opi ike nke ndị mmụọ ozi atọ ndị a ga-afụ.”