Revelation 8:5 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ahụ kwa mmụọ ozi ahụ weere ọkụ sitere nꞌebe ịchụ aja ahụ tinye ya nꞌime ite igwe ntakịrị ahụ o ji chụọ aja, tụda ya, ka ọ danye nꞌime ụwa. Mgbe o mere nke a, ụzụ egbe eluigwe dara, amụma gbukwara nꞌụzọ dị oke egwu. Ala ọma jijiji dakwasịkwara ebe nile nꞌụwa.
Igbo 2006
Mọ-ozi ahu we were ihe ahu eji esure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; o we kpojue ya n-ọku nke sitere n'ọku nke ebe-ichu-àjà ahu, we tubà ya n'uwa: éb͕è-elu-igwe, na olu na àmùmà, na ala-ọma-jijiji we so.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ kwa, mmụọ ozi ahụ weere ọkụ sitere nʼebe ịchụ aja ahụ tinye ya nʼime ite igwe ntakịrị ahụ, tụda ya, ka ọ danye nʼime ụwa. Mgbe o mere nke a, ụzụ egbe eluigwe dara, amụma gbukwara nʼụzọ dị oke egwu. Ala ọma jijiji dakwasịkwara ebe niile nʼụwa.