Revelation 8:7 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe mmụọ nke mbụ fụrụ opi ike ya, a tụdara nkume ọkụ na ọkụ a gwakọtara ya na ọbara nꞌime ụwa. Nke a mere ka otu ụzọ nꞌime ụzọ atọ e kere ụwa nwuru ọkụ. Ihe nile dị nꞌime ya rechapụrụ ọkụ. E mere ka osisi ọhịa na ahịhịa nile rechapụ ọkụ.
Igbo 2006
Onye mbu we fùa opì, ákú-miri-ígwé na ọku we so, nke agwarari ọbara, ewe tubà ha n'uwa: ọku we b͕achasia otù uzọ n'uzọ atọ nke uwa, ọku b͕achasi-kwa-ra otù uzọ n'uzọ atọ nke osisi, ọku b͕achasi-kwa-ra ahihia ndu nile.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe mmụọ ozi nke mbụ fụrụ opi ike ya, a tụdara mkpụrụ mmiri na ọkụ a gwakọtara ya na ọbara nʼime ụwa. Nke a mere ka otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke osisi rechapụrụ ọkụ, e rechapụkwara ahịhịa ndụ niile ọkụ.