Revelation 9:17 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌime ọhụ m, ahụrụ m inyinya ha, hụkwa ndị nọkwasịrị ha nꞌelu. Ndị nọ nꞌelu inyinya ndị a yi uwe igwe e ji ekpuchi obi, nke ụfọdụ nꞌime ha na-acha ọbara ọbara. Ụfọdụ na-acha dị ka akpụkpọ eluigwe, ụfọdụ na-acha odo odo. Ụfọdụ na-acha dị ka anwụrụ ọkụ. Isi inyinya ha dị ka isi ọdụm, anwụrụ ọkụ na ọkụ na nkume ọkụ si ha nꞌọnụ na-apụta.
Igbo 2006
Otù a ka m'hu-kwa-ra inyinya ahu n'ọhù ahu, ha na ndi nānọkwasi ha, nēnwe ihe-agha ihe-agha ib͕ochi obi nke yiri ọku na hyacinth na brimstone: isi inyinya ahu di kwa ka isi ọdum; ọku na anwuru-ọku na brimstone nēsi kwa n'ọnu-ha puta.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼime ọhụ m, ahụrụ m ịnyịnya ha, hụkwa ndị nọkwasịrị ha nʼelu. Ndị nọ nʼelu ịnyịnya ndị a yi ihe ikpuchi obi nke ụfọdụ nʼime ha na-acha ọbara ọbara. Ụfọdụ na-acha dịka akpụkpọ eluigwe, ụfọdụ na-acha odo odo. Ụfọdụ na-acha dịka anwụrụ ọkụ. Isi ịnyịnya ha dịka isi ọdụm, anwụrụ ọkụ na ọkụ na nkume ọkụ sị ha nʼọnụ na-apụta.