Revelation 9:20 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma ndị mmadụ ahụ nile e mere ka ha dịrị ndụ, ndị ọnwụ a na ihuju anya ndị a na-adakwasịghị, mechiri obi ha, jụ ịkpọ isi ala nye Chineke. Ha jụrụ ịkwụsị ife mmụọ ọjọọ ofufe. Ha jụkwara ịkwụsị ife arụsị ha nile nke ha ji ọlaedo na ọlaọcha na igwe na nkume na osisi kpụọ. Chi ndị a nwere anya ma ha adịghị ahụ ụzọ, nke nwere ụkwụ, ma ha adịghị eje ije.
Igbo 2006
Ma ndi fọduru n'etiti madu, ndi anēb͕ughi n'ihe-otiti ndia, echègharighi isi n'ọlu nile nke aka-ha puta, ka ha we ghara ikpọ isi ala nye ndi-mọ ọjọ, ha na arusi-ha nke ọla-edo, na nke ọla-ọcha, na nke ọla, na nke nkume, na nke osisi; nke nāpughi ile ihe anya, ma-ọbu inu ihe, ma-ọbu ije ije:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ndị fọdụrụ nʼetiti mmadụ, bụ ndị a na-egbughị site nʼihe ntaramahụhụ ọrịa ndị a, echegharịghị site nʼọrụ aka ha maọbụ ịkwụsị ife mmụọ ọjọọ ofufe. Ha jụkwara ịkwụsị ife arụsị ha niile nke ha ji ọlaedo na ọlaọcha na bronz na igwe na nkume na osisi kpụọ. Chi ndị na-apụghị ịhụ ụzọ, maọbụ ịnụ ihe, maọbụ ije ije.