Revelation 9:3 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌotu oge ahụ, e mere ka igurube dị ukwuu, nke a na-apụghị ịgụta ọnụ site nꞌime anwụrụ ọkụ ahụ pụta. Igurube ndi a jupụtara ebe nile nꞌụwa. E nyekwara ha ike ịgba mmadụ ọ bụla dị ka akpị.
Igbo 2006
Igurube we si n'anwuru-ọku ahu puta je n'uwa; ewe nye ha ike, dika akpi nke uwa nwere ike.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Igurube sitere nʼanwụrụ ọkụ ahụ pụta fedakwasa ụwa. E nyekwara ha ike ịta mmadụ ọbụla dịka akpị si agba mmadụ.