Revelation 9:5 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Iwu e nyere ha abụghị ka ha gbuo ndị mmadụ kama ọ bụ ka ha mekpaa ha ahụ ọnwa ise. Ndị ha gbara ga-anọkwa nꞌime ahụ ụfụ na nhụju anya dị ka ndị akpị gbara.
Igbo 2006
Ewe nye ha ike ka ha ghara ib͕u ha, kama ka ewe mekpa ha aru ọnwa ise: nmekpa-aru-ha di ka nmeka-aru nke akpi, mb͕e ọ bula ọ nāb͕a madu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Iwu e nyere ha abụghị ka ha gbuo ndị a, kama ọ bụ ka ha mekpaa ha ahụ ọnwa ise. Mmekpa ahụ ha dịka ahụ ụfụ na nhụju anya nke akpị mgbe ọ gbara mmadụ.