Romans 1:16 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi na ihere ikwusa ozi ọma Kraịst adịghị eme m. Nꞌihi na amaara m na ọ bụ ụzọ dị ike nke Chineke kwadooro isite ịzọpụta onye ọ bụla kweere na ya. E buru ụzọ kwusaara ndị Juu ozi ọma a, ugbu a a na-akwusara ya ndị mba ọzọ.
Igbo 2006
N'ihi na ihere ozi ọma ahu adighi-emem: n'ihi na ọ bu ike nke Chineke rue nzọputa nye onye ọ bula nke kwere; onye-Ju na mbu, na onye-Grik kwa.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na ihere oziọma ahụ anaghị eme m, nʼihi na ọ bụ ike Chineke na-ewetara onye ọbụla kwere na ya nzọpụta, nye onye Juu na mbụ nakwa nye onye Griik.