Romans 1:17 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ bụ ozi ọma nke naakọrọ anyị na Chineke edoziela ụzọ anyị ga-esi dị ọcha nꞌihu ya site nꞌokwukwe na ntụkwasị obi anyị nwere na Kraịst. Ozi ọma a na-agwakwa anyị na anyị pụrụ inweta ihe ndị a nile nanị site nꞌokwukwe. Nꞌihi na e deela ya rị nꞌakwụkwọ nsọ sị, “Ọ bụ nanị site nꞌokwukwe ka onye ezi omume ga-esi dị ndụ.”
Igbo 2006
N'ihi na anēkpughe ezi omume Chineke nime ya, site n'okwukwe rue okwukwe: dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ma onye ezi omume gēsite n'okwukwe di ndu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na ọ bụ nʼoziọma ka e kpughere ezi omume Chineke, ezi omume nke na-esite nʼokwukwe ruo okwukwe. Dịka e siri dee ya, “Onye ezi omume ga-esite nʼokwukwe dị ndụ.”