Romans 1:21 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ bụ eziokwu na ha maara na Chineke dị, ma na ndụ ha, ha adịghị ezipụta na ha maara na Chineke dị. Ha anaghị asọpụrụ ya, ha anakwaghị enye Chineke ekele nꞌihi nchebe ọ na-echebe ha. Nanị ihe ha na-eche nꞌobi ha bụ ihe nzuzu, ịtụpụta nꞌuche ha ihe ha chere na Chineke yiri, na ihe ha chere na ọ chọrọ ka ha mee. Ọ bụkwa ụdị echiche dị otu a mere ka obi ha gbaa ọchịchịrị.
Igbo 2006
n'ihi na, ọ bu ezie na ha mara Chineke, ma ha enyeghi Ya otuto dika Chineke, ha ekeleghi kwa Ya; kama emere ha ihe-efu n'ihe nile ha nātule n'obi-ha, obi-ha nke nēnweghi nghọta b͕a-kwa-ra ọchichiri.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụ eziokwu na ha maara Chineke, ma ha anaghị asọpụrụ ya, ha anakwaghị enye ya ekele dịka Chineke. Echiche uche ha bụ ihe efu, nzuzu ha mere ka obi ha gbaa ọchịchịrị.