Romans 1:25 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Kama ha ga-ekwere ihe ahụ ha maara na ọ bụ eziokwu Chineke, ha kpebiri ikwere nꞌokwu ụgha. Nꞌihi ya ha gara nꞌihu ife na ịsọ pụrụkwa ihe Chineke kere eke kama ha ga-efe Chineke, Onye kere ha na onye kwesịrị ka e nye otuto mgbe nile ebighị ebi. Amin!
Igbo 2006
ebe ha were ezi-okwu nke Chineke b͕anwere ugha-ha, ha we sọpuru nēkpe-kwa-ra ihe ekère èkè kama Onye kère èkè, Onye agọziworo ebighi-ebi. Amen.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha were okwu ụgha dochie nʼọnọdụ eziokwu banyere Chineke. Ha na-asọpụrụ, na-efekwa ihe e kere eke, ma hapụ Onye okike, onye a na-eto ruo ebighị ebi. Amen.