Romans 1:29 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ha jupụtara nꞌajọ omume na mmehie nile, anya ukwu, ekworo, obi ọjọọ, igbu mmadụ, esemokwu, aghụghọ, uche ọjọọ, na ntakwu.
Igbo 2006
ebe ha juputara n'ajọ omume nile, ajọ ọlu, anya-uku, obi ọjọ; juputa kwa n'ekworo, ob͕ub͕u-madu, esem-okwu, aghughọ, uche ọjọ; ndi-ntakwu,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha jupụtara nʼajọ omume na mmehie niile, anya ukwu na aghụghọ. Ha jupụtakwara nʼekworo, na igbu mmadụ, na esemokwu, na uche gbagọrọ agbagọ na ịkpọ asị. Ha bụ ndị na-ekwu okwu azụ,