Romans 1:7 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi ya, ana m edere unu nile bi na Rom akwụkwọ a, unu ndị Chineke hụrụ nꞌanya, ndị a kpọkwara ka ha dị nsọ. Ekpere m bụ ka Chineke nna anyị na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, nye unu amara ya na udo ya.
Igbo 2006
Pọl nka nēdegara ndi nile nọ na Rom akwukwọ, bú ndi Chineke huru n'anya, ndi akpọrọ ibu ndi nsọ: Amara diri unu na udo nke si n'aka Chineke Nna-ayi na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist bia.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya bụ, unu ndị Chineke hụrụ nʼanya bi na Rom, ndị ọ kpọrọ ka ha bụrụ ndị nsọ: Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu.