Romans 10:18 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ị̀ na-eche na ndị Juu anụghị ozi ọma mgbe e kwusara ya? Nꞌezie, ha nụrụ ya. “Nꞌihi na ụwa nile anụla olu ndị na-ekwusa ozi ọma a. Ihe ha na-ekwusa eruola nꞌebe ụwa sọtụrụ.”
Igbo 2006
Ma asim, Ọ̀ gābu na ha anughi? Ha nuru ezie, N'uwa nile ka olu-ha puru jezue, Na nsọtu nile nke elu-uwa dum madu bi ka okwu-ha puwo-kwa-ra jezue.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ana m ajụ, Ọ ga-abụ na ha anụghị? Ha nụrụ ya nʼezie. “Nʼụwa niile ka olu ha pụrụ gazuo, okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ.”