Romans 11:1 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ka m jụọ ajụjụ ọzọ. Ọ̀ ga-abụ na Chineke ajụla ndị Juu? Mba! Ana m asị mba nꞌihi na mụ onwe m bụkwa onye Juu. Abụ m nwa nwa Eberaham, bụrụkwa onye si nꞌagburu Benjamin pụta.
Igbo 2006
Ya mere asim, Ọ̀ gābu na Chineke nupuru ndi nke Ya? Chineke ekwela. N'ihi na mu onwem bu kwa onye Israel, si na nkpuru Abraham puta, si kwa n'ebo Benjamin puta.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ a na m ajụ, ọ ga-abụ na Chineke ajụla ndị ya? Mba, nke a apụghị ime, nʼihi na mụ onwe m bụkwa onye Izrel. Abụ m nwa nwa Ebraham, onye si nʼagbụrụ Benjamin pụta.