Romans 11:13 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Geenụ ntị, unu ndị mba ọzọ, matanụ nke ọma na Chineke họpụtara m ịbụ onyeozi Kraịst nye unu. Ana m anyakwa isi nꞌihi ya.
Igbo 2006
Ma ọ bu unu ndi mba ọzọ ka m'nāgwa okwu, (n'ezie, ka ọ ra, bú onye-ozi nke ndi mba ọzọ mu onwem bu, anamenye ije-ozim otuto):
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ugbu a, unu ndị mba ọzọ, ka m na-agwa okwu. Ọ bụ ezie na mụ onwe m bụ onyeozi nye ndị mba ọzọ, ana m enwe afọ ojuju nʼihi ije ozi m.