Romans 11:16 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ebe ọ bụkwa na ibiribe achịcha e ji chụọra Chineke aja bụ ihe dị nsọ, mgbe ahụ achịcha ahụ nile bụ ihe dị nsọ. Nꞌihi na ọ bụru na mgbọrọgwụ osisi dị nsọ, otu a kwa alaka ya ga-adịkwa nsọ.
Igbo 2006
Ma ọ buru na nkpuru mbu di nsọ, ob͕e utu ọka agwọrọ agwọ di kwa nsọ: ọ buru kwa na nkpọrọgwu di nsọ, alaka di kwa nsọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ebe ọ bụkwa na iberibe achịcha e jiri chụọ aja bụ ihe dị nsọ, mgbe ahụ, achịcha ahụ niile bụ ihe dị nsọ. Nʼihi na ọ bụrụ na mgbọrọgwụ osisi dị nsọ, otu a kwa, alaka ya ga-adịkwa nsọ.