Romans 11:2 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Chineke ajụbeghị ndị ya ọ họpụtara site na mmalite ihe nile. Chetakwa ihe Chineke gwara Ịlaija mgbe ọ bịakwutere ya na-agwa ya banyere otu ndị Juu si gbuo ndị amụma na otu ha si dọtusịa ebe ịchụ aja Chineke. Ịlaịja gwara Chineke okwu sị, “Onyenwe m, ha egbuchaala ndị amụma gị nile, mebisịakwa ebe ịchụ aja gị nile, ma ọ bụ nanị m fọdụrụ. Ha na-achọkwa ụzọ igbu m.”
Igbo 2006
Chineke enupughi ndi-Ya nke O buru uzọ mara. Ma-ọbu ùnu amataghi ihe ọ nēkwu, bú ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, n'ebe edeworo okwu bayere Elaija? otú ọ nāriọ Chineke aririọ megide Israel, si,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Chineke ajụbeghị ndị ya bụ ndị ọ họpụtara site na mmalite ihe niile. Ọ bụ na unu amaghị ihe akwụkwọ nsọ na-ekwu banyere Ịlaịja, otu o siri rịọ Chineke arịrịọ megide ụmụ Izrel?