Romans 11:24 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi na ọ bụrụ na Chineke weere unu bụ alaka osisi ọhịa nyapigide unu nꞌosisi ọma ya ahụ, gịnịkwanụ ga-egbochi Chineke ịnabata ndị Juu, mee ka ha laghachi azụ nꞌosisi ahụ e si nyakapụ ha.
Igbo 2006
N'ihi na asi na ebipuru gi onwe-gi n'osisi olive nke bu nke ọhia ka o si puta uwa, ewe nyakudo gi n'osisi olive ọma n'uzọ nke nēmegide ka o si puta uwa: àgēsi aṅa ghara inyakudo kari ndi ahu nke-uku, bú alaka osisi olive ji puta uwa, n'osisi olive nke aka ha?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na asị na e gbupụtara unu site nʼalaka osisi oliv ọhịa, nyapagide unu nʼosisi oliv ọma ahụ nʼụzọ na-abụghị usoro ndụ, gịnị kwanụ ga-egbochi ịnabata alaka ndị ya, bụ ndị si na ya, mee ka ha laghachi azụ nʼosisi oliv ahụ e si nyakapụ ha.