Romans 11:25 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Bikonụ ụmụnna m, achọrọ ka unu mata eziokwu Chineke a dị omimi, ka unu ghara isite nꞌọnọdụ unu bido na-anya isi. Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị Juu na-edo onwe ha imegide ozi ọma ahụ ugbu a, ma omume dị otu a ga-adịgide nanị ruo nꞌoge ọnụ ọgụgụ ndị mba ọzọ a na-anabata zuru.
Igbo 2006
N'ihi na achọghm ka unu ghara ima ihe-omimi a, umu-nnam, ka unu ghara inwe uche n'anya onwe-unu, na emewo Israel obi-etili ufọdu, rue mb͕e ozùzù ndi mba ọzọ gābata;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ụmụnna m, achọrọ m ka unu mata ihe omimi a, ka unu ghara ịnya isi. Nnupu isi ụfọdụ ụmụ Izrel agaghị adịgide kama ọ ga-adị ruo nʼoge ọnụọgụgụ ndị mba ọzọ a ga-anabata zuru.