Romans 11:28 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ugbu a, ndị Juu bụ ndị iro ozi ọma ahụ. Ha kpọrọ ya asị. Ma ịkpọ asị ha kpọrọ ozi ọma a bụ nꞌihi ọdịmma unu, ndị mba ọzọ. Ma ebe ha bụ ndị dị iche a họpụtara, Chineke ka hụkwara ha nꞌanya nꞌihi nkwa ahụ o kwere Eberaham, Aizik na Jekọb.
Igbo 2006
N'akuku ozi ọma, ha bu ndi-iro n'ihi unu: ma n'akuku nrọputa, ha bu ndi ahuru n'anya n'ihi nna-ayi-hà.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihe banyere oziọma, ha bụ ndị iro nke Chineke nʼihi unu. Ma a bịa nʼihe gbasara nhọpụta, ha bụ ndị nke a hụrụ nʼanya nʼihi ndị nna nna ha.