Romans 11:36 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi na Chineke kere ihe nile. Ihe nile na-adịkwa ndụ site nꞌike ya. Ihe nile dịkwa inye ya otuto. Ka otuto dịrị ya ruo mgbe ebighị ebi! Amin.
Igbo 2006
N'ihi na ihe nile sitere nime Ya, site kwa n'aka-Ya, di-kwa-ra Ya. Ọ bu Ya ka otuto diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na ihe niile sitere nʼime ya, sitekwa nʼaka ya, dịkwara ya. Ọ bụ ya ka otuto dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi! Amen.