Romans 11:6 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ bụrụ na a zọpụtara ha site nꞌobi ebere Chineke mgbe ahụ nzọpụta abụghị site nꞌọrụ ọma ha rụrụ. Nꞌihi na ọ bụrụ na a zọpụtara ha site nꞌọrụ ọma ha amara Chineke agaghị abụkwa onyinye a na-anata nꞌefu.
Igbo 2006
Ma ọ buru na ọ di n'amara, o siteghi kwa ọzọ n'ọlu: ebe ahuru na amara abughi amara ọzọ, ma asi na ọ dighi otú a.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụ na o sitere nʼamara, o sighịzikwa nʼọrụ. Nʼihi na ọ bụrụ na o si nʼọrụ, amara ya abụghịkwa amara nʼeziokwu.