Romans 11:7 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ya mere, nke a bụ ọnọdụ ihe nile. Ndị Juu ji ike ha nile na-achọ Chineke, ma ha enweghị ike ịchọta ya. Ụfọdụ nꞌime ha achọtala ya, ndị ahụ Chineke nꞌonwe ya họpụtara nꞌetiti ha site na mmalite. Ma Chineke emeela ka obi ndị ọzọ gbaa itiri.
Igbo 2006
Gini kwa? Ihe Israel nāchọ, nke ahu ka ọ nāhughi; ma nrọputa ahu huru ya, ma emere ka obi ndi fọduru me etili:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Gịnịkwa? Ihe ndị Izrel jiri ike ha niile na-achọ nke ha na-achọtaghị ka ndị a họpụtara chọtara. Ndị nke ọzọ mechiri obi ha.