Romans 12:19 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ụmụnna m, unu abọla ọbọ. Hapụrụnụ Chineke ọrụ ịbọrọ unu ọbọ. Nꞌihi na Chineke kwuru sị, “Ịbọ ọbọ bụ ọrụ m, aga m akwụghachi ha.”
Igbo 2006
Ndi m'huru n'anya, unu abọlara onwe-unu ọ́bọ̀, kama charanu iwe ahu uzọ: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Mu nwe ọ́bọ̀; Mu onwem gēnyeghachi, ka Onye-nwe-ayi kwuru.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị enyi m, unu abọla ọbọ, kama hapụrụnụ Chineke ọrụ ịbọtara unu ọbọ. Nʼihi na e dere ya, “Ịbọ ọbọ dịrị m, aga m akwụghachi,” ka Onyenwe anyị kwuru.