Romans 13:1 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ruberenụ ndị na-achị achị isi nꞌihi na ọ bụ Chineke tọrọ ntọ ala ọchịchị nile dị nꞌụwa taa. Ọ dịghị ọchịchị gọọmentị dị, ma ọ bụghị nke Chineke tọrọ ntọ ala ya.
Igbo 2006
Ka nkpuru-obi ọ bula do onwe-ya n'okpuru ndi nāchi isi n'elu ya: n'ihi na ọ dighi onye ọ bula nāchi isi ma ọ buru na Chineke edoghi ya; ndi nāchi isi bu kwa ndi Chineke doworo.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ka onye ọbụla doo onwe ya nʼokpuru ndị na-achị achị, nʼihi na ikike ọchịchị ọbụla agaghị adị ma ọ bụrụ na Chineke akwadoghị ya. Ọ bụkwa Chineke tọrọ ntọala ikike ọchịchị niile e nwere.