Romans 13:12 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Abalị ekeela abụọ, ọ fọdụrụ ntakịrị ugbu a, ọ bụrụ ụtụtụ, mgbe Kraịst ga-alọghachi. Ya mere, wezuganụ ọrụ ọjọọ nile nke ọchịchịrị, yikwasịkwanụ onwe unu ihe agha nke ezi ndụ, ụdị nke ndị bi nꞌihè kwesịrị iyiri.
Igbo 2006
Chi ejimiwo, chi-ọbubọ di kwa nso: ya mere ka ayi yipu ọlu nile nke ọchichiri, ma ka ayi yikwasi ihe-agha nke ihè.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Abalị ekeela abụọ, ọ fọdụrụ ntakịrị ugbu a, ọ bụrụ ụtụtụ. Ka anyị yipụ uwe ọrụ nke ọchịchịrị, ma yikwasị ngwa agha nke ìhè.