Romans 14:10 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ya mere, o kwesịghị ka i kwujọọ nwanna gị. O kwesikwaghị ka i leda ya anya. Nꞌihi na anyị nile nꞌotu nꞌotu ga-eguzo nꞌihu oche ikpe Chineke nꞌụbọchị ahụ ọ ga-ekpe ụwa ikpe.
Igbo 2006
Ma gi onwe-gi, gini mere i nēkpe nwa-nna-gi ikpé? ma-ọbu gi onwe-gi kwa, gini mere i nākpọ, nwa-nna-gi ihe-efu? n'ihi na ayi nile gēguzo n'iru oche-ikpé Chineke.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma gị onwe gị, gịnị mere i ji ekpe nwanna gị ikpe? Gịnị mekwara i ji eleda ya anya? Nʼihi na anyị niile ga-eguzo nʼotu nʼotu nʼihu oche ikpe Chineke.