Romans 14:13 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ya mere kwụsị ikwujọ nwanna gị, kwụsị ikpe ya ikpe. Kama gbalịa hụ na i biri ndụ gị nꞌụzọ ga-eme ka nwanna gị hapụ ịsụ ngọngọ, mgbe ọ na-ahụ gị ka ị na-eme ihe ahụ o chere nꞌobi ya na ọ bụ mmehie.
Igbo 2006
Ya mere ka ayi ghara ikperita ibe-ayi ikpé ọzọ: ma kama ya kpenu ikpé a, ka onye ọ bula ghara idebe ihe-isu-ngọngọ, ma-ọbu ọnyà, n'uzọ nwa-nna-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, ka anyị kwụsị ikperịta onwe anyị ikpe, kama kpebie nʼime obi gị na i gaghị edochiri nwanna gị ihe ga-eme ka ọ sụọ ngọngọ maọbụ ihe mgbochi nʼụzọ.