Romans 14:15 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ bụrụkwa na ihe ị na-eri na-ewute nwanna gị, ị naghị egosi na ị hụrụ ya nꞌanya ma ị gaa nꞌihu nọgide na-eri ihe ahụ. Ekwela ka nri ị na-eri bụrụ ihe gaewetara nwanna gị ịla nꞌiyi, nꞌihi na cheta na ọ bụkwa nꞌihi ya ka Kraịst ji bịa nwụọ.
Igbo 2006
N'ihi na asi na n'ihi ihe-oriri ọ nēwuta nwa-nna-gi, i dighi-ejeghari ọzọ dika ihu-n'anya si di. Ewela ihe-oriri-gi la onye ahu n'iyì, bú onye Kraist nwuru n'ihi ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụkwa na ihe ị na-eri na-ewute nwanna gị, ị naghị egosi na ị hụrụ ya nʼanya. Ekwela ka nri ị na-eri bụrụ ihe ga-ewetara nwanna gị ịla nʼiyi, nʼihi na cheta na ọ bụkwa nʼihi ya ka Kraịst jiri bịa nwụọ.