Romans 14:2 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi na, dị ka ịma atụ, ọ dị ndị okwukwe ha siri ike, ndị kweere na ha nwere ike iri anụ ọ bụla. Ọ dịkwa ndị ọzọ okwukwe ha na-esighị ike ndị na-eri nanị ahihia nri.
Igbo 2006
Otù onye nwere okwukwe iri ihe nile: ma onye nādighi ike nēri nání ihe anāku n'ubi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu onye nwere okwukwe iri ihe niile, ma onye na-adịghị ike nʼokwukwe, na-eri naanị ahịhịa nri.