Romans 14:22 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ka okwukwe i nwere banyere ihe dị mma oriri dịrị nꞌetiti gị na Chineke. Egosila ya nꞌebe ọ ga-ewute ndị ọzọ, na mmụọ ha. Ngọzi na-adịrị onye na-adịghị emehie nꞌihi na ọ maara na ihe bụ ezi ihe.
Igbo 2006
Okwukwe ahu nke gi onwe-gi nwere, nwe ya n'onwe-gi n'iru Chineke. Ngọzi diri onye nēkpeghi onwe-ya ikpé n'ihe ọ nānwaputa.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, ka okwukwe i nwere banyere ihe ndị a bụrụ nke dị nʼetiti gị na Chineke. Ngọzị na-adịrị onye ọbụla nke na-adịghị ama onwe ya ikpe site nʼihe ọ nabatara.