Romans 14:3 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Onye ahụ kpebiri nꞌobi ya iri ihe nile ekwesịghị ileda onye jụrụ iri ya anya. Otu a kwa, onye ahụ kpebiri na ya agaghị eri ihe nile ekwesịghị ịma onye na-eri ihe ndị a ikpe. Nꞌihi na Chineke anabatala onye ahụ.
Igbo 2006
Ka onye nēri ihe ghara ikpọ onye nādighi-eri ihe-efu; ka onye nādighi-eri ghara kwa ikpe onye nēri ikpé: n'ihi na Chineke kpọbatara ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onye ahụ na-eri ihe niile e kwesighị ileda onye jụrụ iri ya anya. Otu a kwa, onye ahụ nke nʼadịghị eri ihe niile ekwesighị ịma onye na-eri ihe ndị a ikpe. Nʼihi na Chineke anabatala onye ahụ.