Romans 14:5 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
E nwekwara ụfọdụ ndị Kraịst ndị na-eche na ọ dị otu ụbọchị dị nsọ karịa ụbọchị ndị ọzọ, ma ndị ọzọ na-eche na ụbọchị nile bụ nke Chineke. Nꞌụdị okwu dị otu a, ọ dị mma ka onye ọ bụla kpebiere onwe ya.
Igbo 2006
Otù onye nārọputa otù ubọchi kari ubọchi ọzọ: ma onye ọzọ nārọputa ubọchi dum. Ka onye ọ bula nēkwezu nime uche nke aka ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu onye nwere ike na-eche na otu ụbọchị kacha ndị ọzọ na ịdị nsọ, onye nke ọzọ nwekwara ike na-eche na ụbọchị niile bụ otu ihe, ma o kwesiri ka onye ọbụla kpebiere onwe ya.