Romans 14:6 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ bụrụ na o nwere ụbọchị dị iche ị họpụtara dị ka ụbọchị dị nsọ karịa ibe ya, gaa nꞌihu mee ihe ị na-eme nꞌihi na ọ bụ otuto ka ị naenye Chineke. Ọ bụrụkwa na i kpebie nꞌobi gị ịta anụ ọ bụla e ji chụọra arụsị aja, gaa nꞌihu nꞌihe ị na-eme, ọ bụ ihe ziri ezi ka ị na-eme, ebe i nyere Chineke ekele nꞌihi anụ ahụ. Ọ bụrụkwa na ị jụ iso taa ụdị anụ ahụ, i mere nke ọma, nꞌihi na echiche obi gị bụ ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ.
Igbo 2006
Onye nātukwasi uche n'ubọchi, nātukwasi uche na ya n'ebe Onye-nwe-ayi nọ: onye nēri kwa, nēri n'ebe Onye-nwe-ayi nọ, n'ihi na ọ nēkele Chineke; onye nādighi-eri kwa, n'ebe Onye-nwe-ayi nọ ka ọ nādighi-eri, ọ nēkele kwa Chineke.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onye ọbụla na-eche nʼotu ụbọchị bụ nke pụrụ iche, na-eme nke a nye Onyenwe anyị. Onye ọbụla na-eri otu ihe na-eri ya nʼihi Onyenwe anyị. Ma onye na-adịghị eri otu ihe ahụ na-eme kwa nke a nye Onyenwe anyị. Ma na-enyekwa Chineke ekele.