Romans 15:1 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ya mere, ka anyị nile ndị okwukwe ha siri ike hapụ ichefu na anyị ka ọ dịrị inyere ndị okwukwe ha na-esighị ike aka. Anyị ekwesịghị ime nanị ihe na-atọ anyị ụtọ.
Igbo 2006
Ma ayi onwe-ayi, bú ndi nwere ike, ayi aghaghi ibū adighi-ike nile nke ndi nēnweghi ike, na ighara ime ihe nātọ onwe-ayi utọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Anyị onwe anyị bụ ndị dị ike kwesiri ịnagide mgbe ndị na-adịghị ike mejọrọ anyị, ọ bụghị ime ihe ga-atọ anyị ụtọ.