Romans 15:14 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Amaara m, ụmụnna m, na unu jupụtara nꞌezi ndụ, na mmụta. Amakwaara m, na unu maara ihe ndị a nile ruo izi ya ndị ọzọ.
Igbo 2006
Ma emewom ka m'kweye, umu-nnam, ọbuná mu onwem, ihe bayere unu, na unu onwe-unu juputara n'idi-nma, na emejuwo kwa unu n'ihe-ọmuma nile, na unu pu-kwa-ra idurita onwe-unu ọdú.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ụmụnna m, o doro m anya na unu onwe unu jupụtara nʼịdị mma, bụrụkwa ndị tozuru etozu nʼihe ọmụma ruo na unu nwere ike izirịta onwe unu ihe.