Romans 15:27 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ha ji ọṅụ nye onyinye ndị a nꞌihi na o metụrụ ha nꞌobi na o kwesịrị ka ha nyere nzukọ Kraịst dị na Jerusalem aka. Nꞌihi na ọ bụrụ na ọ bụ site nꞌaka ndị Juu ka ha si nata ngọzi nile nke Mmụọ Nsọ, ha ji ụgwọ isite nꞌakụ na ụba ha nwere nyere ndị Juu aka na mkpa ha.
Igbo 2006
N'ihi na ọ di ha ezi nma; ha bu kwa ndi ji ndi ahu ugwọ. N'ihi na asi na ndi mba ọzọ nwekọrọ ihe Mọ Nsọ nke ha, ha ji kwa ugwọ ifè ha òfùfè n'ihe nke anu-aru.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha ji ọṅụ mee nke a, nʼezie ha ji ha ụgwọ i mere ha otu a. Nʼihi na ọ bụrụ na ndị mba ọzọ so ha keta oke na ngọzị nke Mmụọ Nsọ, ha ji ụgwọ isite nʼakụnụba ha nwere kenye ha.