Romans 15:3 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi na Kraịst nꞌonwe ya emeghị ihe tọrọ onwe ya ụtọ, kama dị ka onye dere akwụkwọ Abụ ọma si gwa anyị, “Ọ bịara ka ịta ụta nile na mkparị nile nke ndị na-emegide Chineke dakwasị ya!”
Igbo 2006
N'ihi na Kraist-ayi emeghi kwa ihe tọrọ Onwe-ya utọ; kama, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, Ita-uta nile nke ndi nāta Gi uta dakwasirim.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na Kraịst nʼonwe ya emeghị ihe tọrọ ya ụtọ, kama dịka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ, “Mkparị niile nke ndị na-akparị gị dakwasịrị m!”